Onyeka Onwenu Dị ka Dike Nwaanyị n'Egwu: Mkwuwenye Okwu, Mgba Udo na Ebumnobi Omenala Igbo
Onyeka Onwenu como heroína na música: discurso, luta pela paz e valores culturais Igbo
Mots-clés :
Onyeka Onwenu, Dike Nwaanyị n'Egwu, Nchekwa Omenala Igbo, Mgbagha Okwu, Udo na Ngbanwe EsemokwuRésumé
Ọmụmụ a nyochara Onyeka Onwenu dị ka Dike Nwaanyị n'Egwu, site n'ịtụle etu o si jiri egwu bụrụ ụzọ e si echekwa omenala Igbo, kwalite udo, ma wulite ezi mmekọrịta mmadụ. Ọmụmụ a gbadoro ụkwụ n'ịtụle egwu Ekwe (1984), Iyogogo (1984), One Love (1986) na Mu na Gị Ga-ebi, bụ́ ndị a họpụtara n'ihi na ha na-egosipụta n'ụzọ doro anya echiche banyere ncheta omenala, njirimara ndị Igbo, ịhụnanya, ịdị n'otu na mgbake mmekọrịta mmadụ. Ebumnobi ọmụmụ a bụ ịkọwa etu Onyeka Onwenu si jiri asụsụ, akara ngosi omenala na echiche ndị dị n'egwu ya wee bụrụ onye ncheta omenala na onye na-akwalite udo n'ime ọha mmadụ. A gbasoro usoro nnyocha nkọwa ederede, nke gụnyere ịgụ, ịtụle na ịkọwa ọdịnaya egwu ndị ahụ n'ọnọdụ akụkọ ihe mere eme, omenala na mmekọrịta ọha ha si pụta. A chịkọtara ma nyochaa isiokwu ndị metụtara ncheta omenala, mgbagha okwu, ịhụnanya, ịdị n'otu na mgbanwe mmekọrịta mmadụ. Ntụle ahụ gosiri na Onyeka Onwenu ejighị egwu ya mee naanị ihe ntụrụndụ, kama o jiri ya bụrụ ụzọ e si echekwa asụsụ na omenala Igbo, kpalite mmata banyere njirimara omenala, kwalite mkparịta ụka, ma gbaa ndị mmadụ ume ịnakwere ịhụnanya, imekọ ihe ọnụ na nkwanye ùgwù dịka ntọala udo na mmepe obodo. Ọmụmụ a kwubiri na Onyeka Onwenu bụ Dike Nwaanyị n'Egwu, n'ihi na ọrụ ya gafere ịbụ onye na-abụ abụ wee bụrụ nke onye ncheta omenala, onye na-ewulite udo na onye ndu echiche n'ime ọha mmadụ. Ọmụmụ a na-atụnyekwa aro na egwu Afrịka kwesị ịtụle dịka isi mmalite dị mkpa n'ọmụmụ akụkọ ihe mere eme, omenala na mmekọrịta mmadụ.
*******
Este estudo analisa Onyeka Onwenu como uma *Dike Nwaanyi n'Egwu* (uma mulher heroica na música), examinando como ela utilizou a música como meio para preservar a cultura Igbo, promover a paz e construir bons relacionamentos. O estudo concentra-se na análise das canções *Ekwe* (1984), *Iyogogo* (1984), *One Love* (1986) e *Mu na Gí Ga-ibi*, selecionadas por expressarem claramente ideias sobre memória cultural, identidade Igbo, amor, unidade e recuperação social. O objetivo deste estudo é explicar como Onyeka Onwenu empregou a linguagem, símbolos culturais e as ideias presentes em suas canções para atuar como uma figura de memória cultural e promotora da paz na sociedade. Adotou-se um método de análise textual descritiva, envolvendo a leitura, análise e interpretação do conteúdo das músicas em seus contextos histórico, cultural e social. Foram levantados e analisados temas relacionados à memória cultural, retórica, amor, unidade e mudança social. A análise demonstrou que Onyeka Onwenu não utilizava sua música meramente para entretenimento, mas sim como um meio de preservar a língua e a cultura Igbo, despertar a consciência sobre a identidade cultural, promover o diálogo e incentivar as pessoas a adotarem o amor, a cooperação e o respeito como fundamentos da paz e do desenvolvimento comunitário. O estudo concluiu que Onyeka Onwenu foi uma *Dike Nwaanyi n'Egwu*, pois seu papel transcendeu o de cantora, abrangendo as funções de guardiã da memória cultural, construtora da paz e líder de pensamento na sociedade. O estudo sugere ainda que a música africana deve ser considerada uma fonte importante para o estudo da história, da cultura e das relações humanas.
Téléchargements
Références
Achebe, C. (1958). Things fall apart. Heinemann.
Assmann, J. (2011). Cultural memory and early civilization: Writing, remembrance, and political imagination. Cambridge University Press.
Barber, K. (1991). I could speak until tomorrow: Oriki, women, and the past in a Yoruba town. Edinburgh University Press.
Fairclough, N. (1995). Critical discourse analysis: The critical study of language. Longman.
Finnegan, R. (2012). Oral literature in Africa (Open access ed.). Open Book Publishers. (Original work published 1970)
Galtung, J. (1996). Peace by peaceful means: Peace and conflict, development and civilization. SAGE Publications.
Hall, S. (1997). Representation: Cultural representations and signifying practices. SAGE Publications in association with The Open University.
Lederach, J. P. (2005). The moral imagination: The art and soul of building peace. Oxford University Press.
Merriam, A. P. (1964). The anthropology of music. Northwestern University Press.
Nketia, J. H. K. (1974). The music of Africa. W. W. Norton & Company.
Okpewho, I. (1992). African oral literature: Backgrounds, character, and continuity. Indiana University Press.
Thiong'o, N. wa. (1986). Decolonising the mind: The politics of language in African literature. James Currey.
Van Dijk, T. A. (1998). Ideology: A multidisciplinary approach. SAGE Publications.
Wodak, R., & Meyer, M. (Eds.). (2009). Methods of critical discourse analysis (2nd ed.). SAGE Publications.
Téléchargements
Publiée
Comment citer
Numéro
Rubrique
Licence
© NJINGA&SEPÉ: Revista Internacional de Culturas, Línguas Africanas e Brasileiras 2026

Ce travail est disponible sous licence Creative Commons Attribution - Pas d'Utilisation Commerciale - Pas de Modification 4.0 International.
Les auteurs qui publient dans cette revue acceptent les conditions suivantes:
Les auteurs conservent le droit d'auteur et accordent à la revue le droit de première publication, l'œuvre étant simultanément concédée sous licence Creative Commons Attribution License, qui permet le partage de l'œuvre avec reconnaissance de la paternité de l'œuvre et publication initiale dans ce magazine.
Les auteurs sont autorisés à assumer séparément des contrats supplémentaires, pour la distribution non exclusive de la version de l'ouvrage publié dans cette revue (par exemple, publication dans un référentiel institutionnel ou en tant que chapitre de livre), avec reconnaissance de la paternité et publication initiale dans cette revue.
Les auteurs sont autorisés et encouragés à publier et distribuer leurs travaux en ligne (par exemple dans des référentiels institutionnels ou sur leur page personnelle) à tout moment avant ou pendant le processus éditorial, car cela peut générer des changements productifs, ainsi que citation des travaux publiés (voir l'effet du libre accès).